Oke Osisi Adaala!

 

Si n’Aka

 

Omenka Ejike Eze

 

onoh2

C.C. Onoh

Okaaomee 1 na Ngwo

Ozi si Enugwu eru anyị ntị na-akọwa na Aninefungwu Christian Chukwuma Onoh (Okaaomee I na Ngwo) ebulaala akwụkwọ. Ozi ahụ na-akọwa na Onoh lakwuuru nnanna ya ha ụnyaahụ by Tuuzdee abalị nke ise n’ọnwa Mee afọ 2009.

 

Ndị maara C.C., dịka a na-akpọ ya, ga-ama na ọ bụ ‘Otu Onye A na-asị ‘unu abịala?’ị Ọ bụkwa ‘Dike E Ji Eje Mba’, ‘Anụ Kpọrọ Nkụ na-eju Ọnụ’, ‘Omere Ụmụogbenye’, ‘Gaagaa n’Ogwu’. Gịnị mere m ji etu C.C. aha a niile?

 

Ozi si Enugwu eru anyị ntị na-akọwa na Aninefungwu Christian Chukwuma Onoh (Okaaomee I na Ngwo) ebulaala akwụkwọ.

 

Ndị maara C.C. dịka a na-akpọ ya ga-ama na ọ bụ otu onye a na-asị ‘unu abịala?’ Ọ bụkwa Dike E Ji Eje Mba, Anụ Kpọrọ Nkụ na-eju Ọnụ, Omere Ụmụogbenye, Gaagaa n’Ogwu. Gịnị mere m ji etu C.C. aha a niile?

 

Mgbe mbụ m kpọrọ ụkwụ n’obodo a na-akpọ Ngwo nke dị n’okpuru ọchịchị Udi, otu n’ebe mbụ m gara bụ Enugwu Ngwo ije kirie ụlọ Onoh. Mgbe m pere mpe ka m na-anụ akụkọ na ọ bụ ndịmmụọ wuru ụlọ ahụ, na mmadụ amaghị mgbe ndị na-arụ ya bụ ụlọ ji abịa, nke e ji ama mgbe ha ji ala. Naanị ihe a maara bụ na chi foo, a hụ na ulọ ahụ etinyele karịa ka ọ habu ụbọchị gara aga.

 

Akụkọ kọkwara na o nwere ụbọchị ndị omekome gara ohi n’ụlọ Onoh. Mgbe chi foro, ndị mmadụ gbatara wee hụ na ndị ohi ahụ weere azịza na-aza ezi tutuu ruo mgbe chi fokwuru ha ebe ahụ, aka wee kpara ha.

 

Akụkọ anyị nụrụ gbasara Onoh abụghị out, nke o ji abụ abụọ. Igbo sịrị na ihe onye na-eme ka ekwe ji akpọ ya. Onoh nwa Ngwo bụ okeosisi dịịrị ndịịgbo. Ugbu a okeosisi ahụ dara, ụmụnnụnụ ejule ọhịa. A ga-esi etu ole wee kwọọ onye ukwu wara? Ndịigbo, ihe emele anyị. Nnukwu mmọnwụ alaala. Chi ewerele ehihie jikpo anyị. Chei!

 

Kedu ka anyị ga-esi kọwa ihe dị iche iche Onoh nwa Ngwo meere ndịigbo, tụmadị ndịwaawa iji hụ na alaigbo gara n’ihu. O doro anya na e wepu Onoh, ikekwe anyị agaghị enwe Steeti Enugwu taa, nke anyị ji enwe Steeti Ebonyi. Anyị ga-agụ ole ghara ibe ya? Ọ bụ ndị o tinyere n’ọrụ? ndị ọ zụrụ n’akwụkwọ? ndị o nyeere aka gbapụta ala a na-ana ha n’ike? ndị ọ gbaziere ụzọ n’ụdị dị iche iche? ọgụ ọ lụrụ n’ụlọikpe dị iche iche maka ndịigbo?

 

Ekpere anyị taa bụ ka Chineke nabata mkpụrụobi C.C. Ndịigbo, ndo nu.

 

 

 

 

 

 

 

 

Leave a Reply